3 Ọ zara ha sị, "Gịnị mere unu ji na-ada iwu Chineke nʼihi omenaala unu? 4 Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’15:4 Ọpụ 20:12; Dit 5:16 na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.15:4 Onye ahụ aghaghị ịnwụ’15:4 Ọpụ 21:17; Lev 20:9 5 Ma unu na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla ga-asị nna maọbụ nne ya, ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ ‘onyinye dịrị Chineke.’ 6 Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu.