Publicidade

Números 10

33 Ya mere ha sitere nʼugwu Onyenwe anyị bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike. 34 Igwe ojii Onyenwe anyị dị nʼelu ha nʼehihie mgbe ha si nʼọmụma ụlọ ikwu ha bilie ije.

35 Mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ahụ biliri ije, Mosis na-ekwu sị,

"Bilie O Onyenwe anyị,

ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị;

ka ndị iro gị niile site nʼihu gị gbalaga."

36 Ma mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ bịara ebe izuike, Mosis na-ekwukwa sị,

"Lọghachi O Onyenwe anyị,

bịakwute ọtụtụ mmadụ ndị a, bụ imerime puku ndị Izrel."

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-