16 Nʼụbọchị ahụ,
ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ,
"Atụla egwu, gị Zayọn,
ekwela ka aka gị daa mba.
17 Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,3:17 Maọbụ, ọ ga-eme ka ịdị ọhụrụ
kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ."