Incentivo
A Bíblia é fonte inesgotável de incentivo. Em cada página, Deus nos encoraja a não temer, a perseverar e a confiar que Ele está conosco e é maior que qualquer adversidade.
Deus é por nós
Se Deus é por nós, quem será contra nós? O Senhor fortalece, sustenta e guia seus filhos em cada batalha e desafio.
Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị?
Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.
Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.
Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;
aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,
ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.
Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;
ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu."
Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
Esperança e perseverança
A tribulação produz perseverança, a perseverança produz caráter, e o caráter produz esperança que não decepciona.
Ọ bụkwaghị naanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime nsogbu anyị niile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachiobi. Ntachiobi na-arụpụta nʼime anyị ezi agwa; ezi agwa na-arụpụtakwa olileanya. Olileanya na-eme ka anyị guzo chịm, nʼihi na Chineke awụnyela ịhụnanya ya nʼime obi anyị site nʼonyinye Mmụọ Nsọ.
Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.
Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.
"Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa."
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị. Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu. Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Jisọs sịrị ya, " ‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ."
Deus cuida de nós
Entrega o teu caminho ao Senhor. Lança sobre Ele as tuas ansiedades, porque Ele tem cuidado de nós diariamente.
Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị;
tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ,
ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;
ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada,
nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.
Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,
ọ ga-agba gị ume;
ọ gaghị ekwe
ka ewezuga onye ezi omume.
Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m,
ọ na-azakwa m.
A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,
agaghị m atụ egwu ọbụla.
Futuro e promessas
Eu sei os planos que tenho para vocês — planos de paz e não de mal, para dar-lhes futuro e esperança.
Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.
Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,
kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ."
Jisọs legidere ha anya sị ha, "Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ."
Ma dịka e dere ya,
"Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị,
ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị,
ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya,
bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya."
Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.