Sonhos
Sonhos aparecem em toda a Bíblia como meio de revelação divina. Deus falou através de sonhos a patriarcas, profetas e servos, mas também alertou contra falsos sonhadores.
Sonhos como revelação divina
Deus usou sonhos para comunicar sua vontade a homens e mulheres ao longo da história bíblica, revelando caminhos e mistérios.
Onyenwe anyị gwara ha sị, "Geenụ ntị nʼokwu m ndị a:
"Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu,
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ.
Ana m agwa ya okwu site na nrọ.
"Ma emesịa,
aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.
Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma.
Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, "Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu. Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ. Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru,
" ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ,
aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.
Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma,
ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ,
ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.
Eze jụrụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), "I nwere ike ịgwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ, na ịkọwara m ihe ọ pụtara?"
Daniel gwara eze, "O nweghị onye amamihe ọbụla, onye ọbụla ya na mmụọ na-ekwu okwu, onye mgbaasị ọbụla maọbụ onye na-enyocha kpakpando ọbụla pụrụ ịgwa eze ihe omimi a ị chọrọ. Ma o nwere Chineke nọ nʼeluigwe, onye na-ekpughe ihe omimi niile. O gosila Nebukadneza ihe ga-eme nʼụbọchị ndị dị nʼihu. Nrọ gị na ọhụ niile nke gara nʼuche gị mgbe ị dinara nʼihe ndina gị bụ ndị a:
Sonhos na história da Bíblia
De José no Egito a José pai de Jesus, Deus guiou a história da salvação através de sonhos, protegendo e dirigindo seu povo.
Ha zara sị ya, "Anyị rọrọ nrọ ọjọọ, ma onye nkọwa ya adịghị."
Josef sịrị ha, "Ọ bụghị Chineke nwee ike ịkọwa nrọ? Kọọrọnụ m ha."
Fero gwara Josef sị, "Arọrọ m nrọ ma o nweghị onye ọbụla nwere ike ịkọwara m ihe nrọ m rọrọ pụtara. Ma anụla m na a kọọrọ gị nrọ a rọrọ, i nwere ike ịkọwa ihe nrọ ahụ pụtara."
Josef zara sị ya, "Enweghị m ike ịkọwa nrọ nʼike aka m. Ma Chineke ga-enye Fero ọsịsa udo dịka ọ chọrọ."
Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, "Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, na-azọpụta. nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha."
Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, "Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya."
Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn,
anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.
Sabedoria sobre sonhos
A Bíblia ensina discernimento: nem todo sonho vem de Deus. Devemos entregar nossos planos ao Senhor e confiar na direção dele.
Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị,
ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.
Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ;
maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.
Ọ bụrụ na onye amụma, maọbụ onye na-akọwa nrọ apụta nʼetiti gị kwee nkwa na ihe ịrịbama maọbụ ihe dị ebube na-aga ime, ọ bụrụkwa na ihe ịrịbama ahụ maọbụ ihe ebube ahụ e kwuru maka ya emezuo, emesịa onye amụma ahụ na-asị, "Ka anyị gbaso chi ndị ọzọ dị iche, ka anyị feekwa ha," bụ chi ndị ị na-amaghị, egela okwu onye amụma maọbụ ọrọ nrọ ahụ ntị. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu na-ele unu ule ịmata ma unu jikwa obi unu, na uche unu hụ ya nʼanya. Ọ bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka unu ga-eso, naanị ya ka unu ga-atụ egwu. Debenụ iwu ya niile na-erubekwara ya isi, na-ejere ya ozi, jidesiekwa ya ike.
"Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’ Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?
Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha." Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. "Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla." Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ,
otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ.
Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke.