Pular para o conteúdo
Publicidade

Amós 5

Abụ akwa na ịkpọ oku maka nchegharị

1 Nụrụnụ okwu ndị a, nke a ka m na-ekwu megide unu, bụ mkpu akwa maka gị ezinaụlọ nke Izrel:

2 "Izrel, nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, a daala,

gaghị ebilite ọzọ,

onye a gbahapụrụ nʼala nke aka ya,

dịkwaghị onye ga-ekulite ya."

3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị Izrel,

"Obodo unu nke na-ezipụ puku ndị ike,

ka naanị narị ga-afọdụ,

obodo unu na-ezipụ narị ndị ike

ka naanị iri ga-afọdụrụ."

Chọsienụ Chineke ike ka unu dị ndụ

4 Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel,

"Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ.

5 Unu achọla Betel,

unu abanyekwala na Gilgal,

maọbụ ga ije ruo Bịasheba.

Nʼihi na Gilgal aghaghị ije biri nʼala ọzọ,

ebe Betel ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu."5:5 Maọbụ, ajọ ihe

6 Chọọnụ Onyenwe anyị, ka unu dịrị ndụ,

ka gharakwa iji ike bịakwasị ụlọ Josef, dịka ire ọkụ,

ga-erepịa ha.

Betel agaghị enwe onye ga-emenyụ.

7 Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ghọọ ihe ilu,

na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala.

8 Onye mere kpakpando pleiades na orion,

onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ,

na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị,

onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,

wụsa ha nʼelu ala akọrọ,

Onyenwe anyị bụ aha ya.

9 Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya,

na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike.

10 dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị,

na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya.

11 Unu na-azọpịa ndị ogbenye,

na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha.

Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa,

ma unu agaghị ebi nʼime ha.

Unu akụọla ubi vaịnị mara mma,

ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha.

12 Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba,

matakwa ọtụtụ mmehie unu niile.

Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị.

Ma na-achụpụkwa ndị dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama.

13 Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ,

nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ.

14 Chọsienụ ezi ihe ike, bụghị ihe ọjọọ;

ka unu dịrị ndụ.

Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu,

dịka unu si kwuo.

15 Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya.

Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu.

O nwere ike bụrụ na Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile

ga-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef.

16 Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị,

"Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile;

bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa.

A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa,

kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa.

17 A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile,

nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,"

ka Onyenwe anyị kwuru.

Ụbọchị Onyenwe anyị

18 Ahụhụ dịrị unu,5:18 Maọbụ, Azịgba unu

ndị ahụ na-achọsi ụbọchị Onyenwe anyị ike.

Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke Onyenwe anyị ahụ?

Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, bụghị ìhè.

19 ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ

ma zute anụ ọhịa bịa,

maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike

ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ,

agwọ ataa ya.

20 Ụbọchị Onyenwe anyị gaghị abụ ụbọchị ọchịchịrị, na-abụghị ìhè,

nke oke ọchịchịrị, a na-agaghị enwe ìhè ọbụla na ya?

21 "Akpọrọ m mmemme oriri na ọṅụṅụ unu asị, ajụla m ya.

Nnọkọ nke oke nzukọ unu adịghị atọkwa m ụtọ.

22 A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu,

agaghị m anabata ha.

Aja udo nke anụ unu gbara abụba

abụrụghị m ihe ọbụla.

23 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga ụzụ ịbụ abụ unu.

Agaghị m ege ntị nʼabụ ụbọ akwara unu.

24 Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri,

ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata.

25 "Iri afọ anọ ndị ahụ unu nọ nʼọzara,

unu chụụrụ m aja, unu o wetara m onyinye, unu ụlọ Izrel?

26 Unu ga-ebuli eze unu Sakut elu,

na arụsị Kayiwan, chi kpakpando unu,

bụ onyinyo unu, na chi niile a kpụrụ akpụ,

nke unu kpụrụ nye onwe unu.

27 Ya mere, aghaghị m ime ka e buru unu gaa nʼala ndị ọzọ, nʼofe Damaskọs,"

ka Onyenwe anyị, Onye ahụ aha ya bụ Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

Veja também