2"Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso."
8Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu.
15Ma Jisọs zara ya sị, "Kwere ka ọ dịrị otu a ugbu a, o kwesiri ka anyị mezuo ezi omume niile." Mgbe ahụ Jọn kwenyere.
125 resultados encontrados
2"Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso."
8Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu.
15Ma Jisọs zara ya sị, "Kwere ka ọ dịrị otu a ugbu a, o kwesiri ka anyị mezuo ezi omume niile." Mgbe ahụ Jọn kwenyere.
7Nke a mere ka Onyenwe anyị wee iwe megide ha. O nyefere ha nʼaka ndị Filistia na ndị Amọn,
11Ma Onyenwe anyị sịrị ndị Izrel, "Mgbe ndị Ijipt, ndị Amọrait, ndị Amọn, ndị Filistia,
14Kpọkuonụ chi ndị ahụ bụ ndị unu họpụtaara onwe unu, ka ha zọpụta unu mgbe ọbụla nsogbu dakwasịrị unu!"
2Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị.
3Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị,"Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile dị.Ụwa niile jupụtara nʼebube ya."
5Etiri m mkpu akwa sị. "Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!"
4Zie ha ozi ha ga-ezi ndị nwe ha, sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, sị, "Zienụ ndị nna unu ukwu ozi a, sị,
14Egela ntị nʼokwu ndị amụma na-agwa gị sị, ‘Unu agaghị efe eze Babilọn,’ nʼihi na ọ bụ okwu ụgha ka ha na-agwa unu.
17Unu egela ha ntị. Feenụ eze Babilọn, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼụzọ ahụ ka unu ga-esi dịrị ndụ. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji kwenye ka obodo a ghọọ mkpọmkpọ ebe?
3Nganga nke obi gị eduhiela gị,gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu,onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu.Gị onye na-ekwu nʼime obi ya,‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’
10Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike.Ihere ga-ekpuchi gị;a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
15"Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nsonye mba niile.Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị;ihe i metara ga-adị gị nʼisi.
5O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe,21:5 Nke a bụ anyanwụ, ọnwa na kpakpando nʼogige abụọ nke nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị,
20O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Manase mere.
34Shoma amụọAhi, Roga, Huba na Aram.
37Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
38Jeta mụtaraJefune, Pispa na Ara.
1Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jona nwa Amitai, na-asị,
4Ma Onyenwe anyị mere ka ifufe dị egwu malite ife nʼelu osimiri ahụ, ebili mmiri bidokwara na-amagharị, chọọ itiwasị ụgbọ mmiri ahụ.
17Ma Onyenwe anyị akwadolarị otu azụ buru ibu ka o loo Jona. Ya mere, Jona nọrọ nʼafọ azụ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị.
14"Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu Onyenwe anyị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị Onyenwe anyị ofufe.
15Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị."
17Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee.
1Oke ihe ịrịbama pụtara ihe nʼeluigwe, otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dịka uwe. Ọnwa dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpueze nwee kpakpando iri na abụọ dịkwa ya nʼisi.
2Ọ dị ime, na-etikwa mkpu nʼihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa.
8ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe.
9E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, nʼobodo Timnat Heres, nʼala ugwu ugwu nke ebo Ifrem, nʼụzọ mgbago ugwu Gaash.
12Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe.
13Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe.2:13 Abụ 106:36
4Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a.
8Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ.
20Onyenwe anyị nụrụ ekpere Hezekaya gwọọkwa ha.
1Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo.
3Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ,
21Nʼotu aka ahụ, o fesakwara ọbara ahụ nʼelu ụlọ ikwu na nʼelu ihe niile dị nʼụlọ ikwu, bụ ihe niile e ji efe ofufe.
1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
11"Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
21Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide mgbe ebighị ebi."Nwoke ahụ na-efesa mmiri ahụ e ji edo mmadụ ọcha, aghaghị ịsacha uwe ya niile. Onye ọbụla metụrụ mmiri nke ịdị ọcha ahụ aka, ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
4Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme.Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche.Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe.Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niilena-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.
6Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,13:6 Izk 30:3; Ems 5:18; Zef 1:7; Mkp 6:17ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.
7Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.
2Ọ naghị ege onye ọbụla ntị,ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị.Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi,ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso.
4Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ,ha bụkwa ndị aghụghọ.Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọna-ejikwa ike emebi iwu.
5Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume.Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ.3:5 Maọbụ, ihe na-ezighị eziỤtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè;ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya,ma ndị ajọ omume enweghị ihere.
3aka Onyenwe anyị ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu.
34Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo na mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe akwụsịla, o mehiere ọzọ. Ya na ndị na-ejere ya ozi gara nʼihu nyịchie obi ha.
35Ya mere, Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ jụrụ ikwere ka ụmụ Izrel pụọ, dịka Onyenwe anyị gwararịị Mosis.
17O buuru obe ya gaa nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi (nke pụtara Gọlgọta nʼasụsụ Hibru).
28Nʼikpeazụ, mgbe Jisọs matara na ihe niile emezuola. Ma iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ọ sịrị, "Akpịrị na-akpọ m nkụ."
35Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.
5Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m.
8Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
16Nyenụ Onyenwe anyị Chineke unu nsọpụrụ.Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu;tupu unu akpọbie ụkwụ ununʼelu ugwu gbara ọchịchịrị.Unu na-ele anya ìhèma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị.Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ.
1Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,"Ọ dịghị Chineke ọbụla dị."Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ;ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
2Chineke sitere nʼeluigwena-ele ụmụ mmadụ anya,ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta,onye nke na-achọ Chineke.
5Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu,ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị.Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị;i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha.