Ụbọchị ukwu nke Onyenwe anyị
14 Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso,
ọ na-abịakwa ọsịịsọ.
Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu.
A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.
15 Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma,
ụbọchị ahụhụ na mkpagbu,
ụbọchị nsogbu na mbibi,
ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ,
ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,
16 ụbọchị opi ike na iti mkpu agha
imegide obodo niile e wusiri ike,
na imegide akụkụ ụlọ elu niile.
17 "Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ,
mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì,
nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị.
A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu,
tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ.
18 Ọlaọcha na ọlaedo ha
agaghị azọpụta ha
nʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ."
A ga-erechapụ ụwa niile
site nʼọkụ ekworo ya,
nʼihi na ọ bụ na mberede
ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.