22 Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa,
nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
23 Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;
ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
24 Mkpụrụobi m na-ekwu, "Onyenwe anyị bụ oke m,
nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya."