3Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu yaọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla.
11Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume,ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi.
12Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume,tookwanụ aha nsọ ya.
125 resultados encontrados
3Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu yaọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla.
11Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume,ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi.
12Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume,tookwanụ aha nsọ ya.
1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, "Jekwuru Fero gwa ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Hapụ ndị m, ka ha gaa fee m ofufe.
24Nʼechi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe ijiji dị egwu nʼọnụọgụgụ bịara nʼala Ijipt, jupụta nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị niile na-ejere ya ozi, na nʼala Ijipt niile. E mere ka ala Ijipt bụrụ ihe e ji ijiji mebie.
30Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Fero pụọ rịọọ Onyenwe anyị ka o mee ka ijiji ndị a gabiga.
6Ebram kweere nʼihe Onyenwe anyị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume.
15Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka.
20na ala ndị Het, na nke ndị Periz na nke ndị Refaim,
4Unu agaghị efe Onyenwe anyị Chineke unu ofufe dịka ndị ahụ na-efe arụsị na-eme.
24Erila ọbara, wụsa ya nʼala dịka mmiri.
31Efekwala Onyenwe anyị bụ Chineke gị dịka ha si efe chi ha, nʼihi na mgbe ha na-efe chi ha ofufe, ha na-eme ihe arụ dị iche iche nke Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụladị ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ka ha na-esure nʼọkụ nye chi ha dị iche iche dịka aja.
10zọpụta ya na mkpagbu ya niile, mee ka o nwee ihuọma na amamihe nʼihu Fero eze Ijipt. Onye mere ya onye ọchịchị nʼala Ijipt na onye nlekọta nke ezinaụlọ ya niile.
13Mgbe ha gara Ijipt nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata ya, Fero matakwara ụmụnne Josef.
18ruo mgbe eze ọzọ nke na-amaghị Josef, bidoro ịchị ọchịchị nʼala Ijipt.7:18 Ọpụ 1:8
2I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ.
4Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead.
32Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, "Onye dịnyeere m?" Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya.
21"Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha.
22Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ.
23Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile,
5Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
7Ime ka ha dị ọcha, lee ihe ị ga-eme. Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Hụkwa na ha kpụchapụrụ ajị niile dị ha nʼahụ, ma sachaa uwe ha. Si otu a mee ka ha bụrụ ndị dị ọcha.
23Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
6Na-atụfughị oge, Fero rigoro nʼelu ụgbọ agha ya, duru ndị agha ya ịchụso ha.
8Onyenwe anyị mere ka obi Fero eze Ijipt sie ike. Ọ chụsoro ụmụ Izrel, ndị na-aga nʼihu nʼije ha, na-atụghị egwu maọbụ ịda mba.
17Aga m eme ka obi ndị Ijipt sie ike, ka ha sorokwa unu nʼazụ banye. Aga m ewetara onwe m otuto site na Fero, na ndị agha niile, na ụgbọ agha niile nakwa ndị na-agba ịnyịnya ya.
1O Onyenwe anyị, ị nyochaala m,ị makwaara m nke ọma
17Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke!Leekwa ka ha si dị ukwuu.
23O Chineke, nyochaa m, mara obi m.Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.
18ịchị ehihie na abalị na ịkpa oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
19Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke anọ.
31Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na ọ dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke isii.
2O jiri mma agha gbuo Jemis nwanne Jọn.
22Igwe mmadụ ahụ nọ na-eti mkpu, "Nke a abụghị olu mmadụ, ọ bụ olu chi!"
24Ma okwu Chineke gara nʼihu na-aba ụba na-agbasakwa.
1Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.
2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe;jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya
3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke.Ọ bụ ya onwe ya kere anyị,100:3 Job 10:3; Efe 2:10 ọ bụkwa ya nwe anyị,anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.
6Tụhịakwa akwa ike nʼisi ahụ nʼisi ya. Tinye okpu nsọ ahụ nʼelu akwa ike nʼisi ahụ.
7Werekwa mmanụ nsọ ahụ, tee ya, site nʼịwụkwasị ya nʼisi ya.
16Gbuo ya. Werekwa ọbara ya fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja.
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
17Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
26Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
2Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri.
14Mgbe ihe gaara gị nke ọma, chetakwa m, ma gosi m obiọma, gwara m Fero ka o si nʼụlọ mkpọrọ a wepụta m.
16Mgbe onyeisi ndị na-esiri Fero nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị Josef, "Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi.
5Mgbe nke a na-eme, ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ11:5 Gbaa gburugburu ala niile dị nʼetiti ọwụwa anyanwụ, ọdịnihu ezinaụlọ ọbụla na-adabere nʼọkpara. nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero, onye nọ ugbu a nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara ohu onye nwanyị na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nri, na ụmụ ehi niile e bụ ụzọ mụọ.
8Ndị ọchịchị gị ndị a ga-abịa gbuo ikpere rịọọ m sị m, ‘Biko kpọrọ ndị gị pụọ nʼobodo anyị.’ Mgbe ha mesịrị nke a, aga m apụ." Iwe were Mosis mgbe o si nʼụlọ Fero na-apụta.
9Onyenwe anyị agwalarị Mosis sị ya, "Fero agaghị ege gị ntị. Nke a ga-enye m ohere ime ọtụtụ ihe ebube dị iche iche nʼIjipt."
15Mgbe ndị ozi Fero hụrụ ya, ha toro ya nʼihu Fero. Nʼihi nke a, ha kpọbatara Serai nʼụlọeze Fero.
16Fero mesoro Ebram mmeso ọma nʼihi nwunye ya. Ebram nwetara igwe atụrụ, na ehi, na nne ịnyịnya ibu, oke na nwunye, na ndị ohu ndị nwoke na ndị nwanyị, na ịnyịnya kamel.
17Ma Onyenwe anyị jiri ajọọ ọrịa tie Fero na ndị ezinaụlọ ya ihe otiti nʼihi Serai nwunye Ebram.
2Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa;ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu
4O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi,meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi.
10Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu,meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.
15mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma,na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.
21Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, "Mgbe i ruru Ijipt, hụ na ị gara nʼihu Fero mee ihe ebube niile m nyere gị ike ime. Ma aga m eme ka obi ya sie ike, ka ọ ghara ikwe ka ndị m laa.
22Ị ga-agwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Izrel bụ Ọkpara m.
31Mgbe ahụ, ha kwenyere; dịka ha nụrụ na Onyenwe anyị eletala ụmụ Izrel, ma hụkwa ahụhụ ha. Ha kpọrọ isiala fee ya ofufe.