Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ nke Abụ 3

1 Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya

nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya.

Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya.

2 Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile

na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya,

m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya.

Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.

3 Ndị nche na-eche obodo3:3 Aịz 21:11-12 hụrụ m,

mgbe ha na-agagharị nʼobodo,

ma ajụrụ m ha sị, "Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?"

4 dịghị anya mgbe m gafere ha,

achọtara m onye m hụrụ nʼanya,

ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka

tutu m duta ya nʼụlọ nne m,

nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.

5 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,

eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị,

unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta

ruo mgbe o masịrị ya.

6 Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa

dịka anwụrụ ọkụ,

nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ,

ụda nke ndị ahịa na-ere?

7 Lee bụ ụgbọ Solomọn.

Iri mmadụ isii ndị ọka agha,

ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.

8 Ha niile ji mma agha;

ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha.

Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya,

ịdị njikere maka ihe egwu abalị.

9 Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a

nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.

10 Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee;

ala ya bụkwa ọlaedo.

Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa,

e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya.

Ndị inyom Jerusalem, 11 pụtanụ,

bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn,

bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze;

lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi,

nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya,

nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.

Veja também