Pular para o conteúdo
Publicidade

Eclesiastes 3

Ihe niile nwere oge

1 Ihe ọbụla nwere oge;

mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.

2 Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ,

oge ịkụ ihe na oge ihopu,

3 oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa,

oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,

4 oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị,3:4 Rom 12:15

oge iru ụjụ na oge ite egwu,

5 oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume,

oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,

6 oge ịchọ ihe, na oge ntufu,

oge ịchịkọba, na oge ichifusi,

7 oge ndọwasị, na oge ndụkọta,

oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,3:7 Ems 5:13; Ilu 25:11

8 oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị,

oge ibu agha, na oge ime udo.

Veja também