Ihe niile nwere oge
1 Ihe ọbụla nwere oge;
mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.
2 Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ,
oge ịkụ ihe na oge ihopu,
3 oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa,
oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,
4 oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị,3:4 Rom 12:15
oge iru ụjụ na oge ite egwu,
5 oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume,
oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,
6 oge ịchọ ihe, na oge ntufu,
oge ịchịkọba, na oge ichifusi,
7 oge ndọwasị, na oge ndụkọta,
oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,3:7 Ems 5:13; Ilu 25:11
8 oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị,
oge ibu agha, na oge ime udo.