10 "Tie mkpu ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị Ada Zayọn. Nʼihi na ana m abịa ibi nʼetiti gị," otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 11 "Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ mba dị iche iche ga-adịnyere Onyenwe anyị, bụrụkwa ndị nke m. Aga m ebi nʼetiti gị, ị ga-amatakwa na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ka m bịakwute gị. 12 Onyenwe anyị ga-eketa Juda dịka oke ya nʼime ala ahụ dị nsọ. Ọ ga-ahọrọkwa Jerusalem ọzọ.
Publicidade
Publicidade