1 Ya mere, cheta Onye kere gị
mgbe ị ka bụ okorobịa,
tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa,
na mgbe afọ aka abịarubeghị
mgbe ị ga-asị, "Ha anaghị atọkwa m ụtọ."
2 Tupu anyanwụ na ìhè,
ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị,
na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri.
3 Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji,
mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata,
mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole,
mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,