36 Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nʼihi na ị wụpụrụ agụụ nke anụ ahụ gị, kpugheekwa ọtọ gị nʼịkwa iko gị nke gị na ndị ị hụrụ nʼanya na-akwa, na nʼihi arụsị gị niile rụrụ arụ, nakwa nʼihi na ị nyere ha ọbara ụmụ gị, 37 nʼihi ya, aga m achịkọta ndị niile bụ ndị ahụ niile ị hụrụ nʼanya, ndị gị na ha na-enwe obi ụtọ, ndị ị hụrụ nʼanya, ma ndị ị kpọrọ asị. Aga m achịkọta ha site gburugburu gị imegide gị, gbaa gị ọtọ nʼihu ha, ka ha hụ ọtọ gị niile.