Pular para o conteúdo
Publicidade

Hosiya 3

Hosiya na nwunye ya adịrịkwa na mma

1 Onyenwe anyị gwara m ọzọ, "Gakwuru nwanyị a na-akwa iko, nke na-emekwa enyi na-ezighị ezi, gosi ya ịhụnanya gị dịka Onyenwe anyị si hụ ndị Izrel nʼanya, nʼagbanyeghị na ha na-eso chi ndị ọzọ na-enwekwa mmasị dị ukwuu nʼachịcha nsọ e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee."

2 Nʼihi ya, eweere m ego ọlaọcha dị iri na ise, na otu ntụju ọka homa, na ọka balị zụta ya. 3 Mgbe ahụ agwara m ya, "Mụ na gị ga-ebi ọtụtụ ụbọchị, gaghị agbakwa akwụna, maọbụ nwee nwoke ọbụla gị na ya ga-enwe mmekọ, otu a ka m ga-emekwa nʼebe nọ."

Veja também