Pular para o conteúdo
Publicidade

Oséias 4

Okwu Onyenwe anyị megide Izrel

1 Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel,

nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo4:1 Maọbụ, Onyenwe anyị akpọọla unu ikpe

megide unu ndị bi nʼala a.

"Nʼihi na dịghị ikwesi ntụkwasị obi, dịghị ịhụnanya,

dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.4:1 Ịma ihe banyere Chineke adịghị nʼuche unu

2 bụ naanị ịbụ ọnụ,4:2 Maọbụ, ịṅụ iyi ịgha ụgha na igbu mmadụ,

izu ohi na ịkwa iko.

Ọgbaaghara dị nʼebe niile,

ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.

3 Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ,

ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,4:3 Maọbụ, na-anwụkwa anwụ

ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe,

bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.

4 "Ma otu dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu,

ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo.

Nʼihi na ndị gị dịka

ndị na-eseso onye nchụaja okwu.

5 na-asọ ngọngọ ehihie na abalị,

ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ.

Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi

6 ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe.

"Ebe bụ na jụrụ ihe ọmụma,

aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m;

ebe bụ na gbakụtara iwu Chineke gị azụ

mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.

7 Ka ha4:7 Ya bụ, ndị nchụaja na-abawanye nʼọnụọgụgụ,

otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m,

ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.4:7 Akwụkwọ Masori na-ede, nsọpụrụ ha ka m gbanwere ka ọ ghọọ ihere

8 Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m.

Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.

9 ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa.

Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ

ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.

10 "Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha.

Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba,

nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị,

were onwe ha nyefee 11 nʼaka ịgba akwụna,

na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ,

nke na-ewepụ mmụọ nghọta.

12 Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme,

na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye na-ajụ ase.

Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo;

ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.

13 Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile,

na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile,

na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint,

ebe ndo ya dị ezi mma.

Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna,

ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.

14 "Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ,

mgbe ha na-agba akwụna,

maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ

mgbe ha na-akwa iko,

nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna,

ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja,

ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.

15 "bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel,

ma ka ikpe gharakwa ịma Juda.

"Unu agakwala Gilgal,

unu agakwala ruo Bet-Aven,

unu aṅụkwala iyi sị, Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.

16 Ndị Izrel dị isiike

dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike.

Onyenwe anyị ga-esi aṅaa zụọ ha

dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?

17 Ifrem na arụsị agbaala ndụ

hapụ ya ka nọọrọ onwe ya.

18 bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ,

ha na-aga nʼihu na-agba akwụna;

ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.

19 Ifufe ga-ebupụ ha,

aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.

Veja também