Pular para o conteúdo
Publicidade

Oséias 2

1 "Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, nke pụtara ndị m,gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, Unu ndị m hụrụ nʼanya.

Ntaramahụhụ na nlọta

2 "Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya,

nʼihi na bụghị nwunye m,

mụ onwe m abụkwaghị di ya.

Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya,

ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.

3 Ma bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka gbara ọtọ,

aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya.

Aga m eme ya ka dị ka ọzara,

ka ghọọ nʼala kpọrọ nkụ,

were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka nwụọ.

4 Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m,

nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.

5 Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko,

tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere.

Site nʼikwu sị, Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya,

ndị na-enye m nri na mmiri,

ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.

6 Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu;

aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ghara ịma ebe na-eje.

7 ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma gaghị achụkwute ha.

ga-achọ ha ma gaghị ahụ ha.

Mgbe ahụ, ga-asị,

Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m,

nʼihi na dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.

8 Ma kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m,

na bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv,

na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile

nke o ji na-efe Baal.

9 "Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe chara,

na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru.

Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m,

nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.

10 Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya

nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,2:10 Ndị ya na ha na-akwa iko

dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.

11 Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;

bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ,

nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.

12 Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,

nke sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya;

aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa,

anụ ọhịa ga-eripịa ha.

13 Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile

bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile,

chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya,

pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya,

ma chezọọ m," Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

14 "Nʼihi nke a, aga m arara ya,

duba ya nʼime ọzara,

jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.

15 Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya,

gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ghọọ ọnụ ụzọ olileanya.

Mgbe ahụ, ga-azakwa m dịka o mere mgbe bụ agbọghọbịa,

nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.

16 "Nʼụbọchị ahụ," otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,

"ga-akpọ m Di m,

gaghị akpọkwa m nna m ukwu,ọzọ.2:16 Maọbụ, Baal nʼasụsụ Hibru

17 Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya,

ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.

18 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ,

meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ,

na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ.

Aga m emebi ngwa agha niile,

agha niile ga-akwụsịkwa.

Mgbe ahụ, a ga-eme ka dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.

19 Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi;

aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi,

nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.

20 Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị.

ga-amatakwa Onyenwe anyị.

21 "Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,"

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

"M ga-azaghachi eluigwe,

ha ga-azaghachi ala.

22 Ala ga-azaghachi ọka

na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv,

mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril.

23 Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ.

Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, Onye m na-ahụghị nʼanya.2:23 Enwekwa obi ebere nʼahụ Lo-Ruhama,

M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, Ndị na-abụghị ndị m,2:23 Ya bụ, Lo-ammi,Unu bụ ndị nke m,

Ha ga-azakwa, Chineke m ka bụ.’ "

Veja também