4 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-agwa ndị niile m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha buru laa Babilọn, 5 "Wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya; kụọnụ ihe nʼubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya; 6 lụọnụ nwunye, mụọkwanụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom; lụọkwaranụ ụmụ unu ndị ikom nwunye, kwenyekwanụ ka ụmụ unu ndị inyom lụọ di, ka ha mụọkwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Mụbaanụ nʼebe ahụ, unu ebilatakwala. 7 Chọọnụ udo nke obodo ahụ m mere ka unu gaa biri nʼime ya. Kpeekwanụ ekpere nye Onyenwe anyị banyere ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ihe agaara obodo ahụ nke ọma, ọ ga-agakwara unu nke ọma."
Publicidade