Pular para o conteúdo
Publicidade

Jeremias 31

31 "Lee, oge na-abịa," ka Onyenwe anyị kwupụtara,

"mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị

nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,

nakwa ụlọ Juda.

32 bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ

mụ na nna nna ha gbara,

mgbe ahụ m jidere ha nʼaka

site nʼala Ijipt dupụta ha,

nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,

bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,"

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

33 "Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba

mgbe oge ndị ahụ gasịrị," ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,

aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.

Aga m abụ Chineke ha,

ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.

Veja também