Publicidade

Jeremias 31

31 "Lee, oge na-abịa," ka Onyenwe anyị kwupụtara,

"mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị

nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,

nakwa ụlọ Juda.

32 bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ

mụ na nna nna ha gbara,

mgbe ahụ m jidere ha nʼaka

site nʼala Ijipt dupụta ha,

nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,

bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,"

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

33 "Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba

mgbe oge ndị ahụ gasịrị," ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,

aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.

Aga m abụ Chineke ha,

ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.

34 dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,

maọbụ otu onye asị ibe ya, Mara Onyenwe anyị,

nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,

site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

"Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,

agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ."

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-