6 Asịrị m, "Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Lee, amaghị m ekwu okwu. Abụ m naanị nwantakịrị."
7 Ma Onyenwe anyị sịrị m, "Asịkwala ‘Abụ m naanị nwantakịrị,’ nʼihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ị ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu. 8 Atụkwala egwu nʼihi ha, nʼihi na mụ onwe nọnyere gị ịnapụta gị," ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.