NʼỤlọ ọkpụ ite
1 Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya. 2 "Bilie, jee nʼụlọ ọkpụ ite, ebe ahụ ka m ga-anọ zie gị ozi." 3 Ya mere, ebiliri m jee nʼụlọ ọkpụ ite, bịakwute ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na nkume ịkpụ ihe. 4 Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya.
5 Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, 6 Ọ sịrị, "Ọ bụ na m apụghị ime unu dịka ọkpụ ite a mere, unu ụmụ Izrel?" Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, "Dịka ụrọ si dị nʼaka ọkpụ ite ahụ, otu a ka unu onwe unu si dịrị nʼaka m, gị Izrel.