Publicidade

Jeremias 20

14 Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ.

Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị.

15 Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m,

nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya,

"A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!"

16 Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ

o bibiri na-enweghị ọmịiko.

Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ,

na akwa ibu agha nʼehihie.

17 Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m,

hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m,

ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi.

18 Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta

ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute,

na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-22_10-02-25-