7 "Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.
Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.
8 Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ.
Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ,
akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya.
Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị.
Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ."