11 Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi. 12 Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị. 13 Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
Publicidade
Publicidade