9 Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa,
otu a ka ụtọ enyi dị,
site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.
10 Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị.
Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka.
Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.