23 Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,
nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
24 Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta;
kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.
25 Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu;
atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.
26 Leruo ije ụkwụ gị anya,
doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.
27 Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe;
si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.