Pular para o conteúdo
Publicidade

Ilu 5

8 Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!

Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,

9 ka ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,

maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.

10 Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị,

ka ihe niile dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ.

11 Ka gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ

mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị.

12 Mgbe ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị!

"Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya!

13 Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m

maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m.

14 Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi

nʼihu ọha mmadụ niile."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também