Ịdọ aka na ntị banyere ịkwa iko
20 Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu,
ahapụkwala iwu nke nne gị.6:20 Efe 6:1
21 Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile,
ka ị ghara ichefu ha.
22 Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị;
mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị.
Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
23 Nʼihi na iwu a bụ oriọna,6:23 Abụ 119:105
Ihe ozizi a bụkwa ìhè,6:23 Abụ 19:8; 2Pt 1:19
otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba
bụ ụzọ ezi ndụ,