Pular para o conteúdo
Publicidade

Provérbios 9

Ọkpụkpọ oku nke amamihe na nzuzu

1 Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya

nʼelu ogidi asaa.

2 O doziela oriri ya nʼusoro,

o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya.9:2 A na-eji ụda máá gwakọọ na mmanya i ji mee ka ọtọ ezi ụtọ nʼọnụ.

3 O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile,

site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị,

4 "Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche"

Ma nye ndị amamihe kọrọ, na-asị,

5 "Bịanụ, rie nri m,

ṅụọkwa mmanya m gwakọtara.

6 Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ;

gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe."

7 Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị;

onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha.

8 Abarala ndị na-akwa emo mba, ma bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị;

baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya.

9 Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ga-ama ihe karịa,

kuziere onye ziri ezi ihe ga-atụkwasị ihe mụtara nʼamamihe ya.

10 Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,

inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.

11 Nʼihi na bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo.

A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.

12 bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru,

ma bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.

13 Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ,

o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya.

14 na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya,

nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo,

15 na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku,

bụ ndị na-aga mkpa ha,

16 "Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m."

na-asịkwa ndị na-enweghị uche,

17 "Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ,

nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ."

18 Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ,

na ndị kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ.

Veja também