Jidesie amamihe aka ike
20 Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ.
Olu ya na-ada ụda nʼama.
21 Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku,
nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile.
22 "Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya?
Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo?
Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?
23 Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu,
aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu,
aga m emekwa ka unu mara okwu m.