Pular para o conteúdo
Publicidade

Provérbios 31

10 Nwanyị nwere ugwu31:10 Maọbụ, Nwanyị nwere agwa ọma na-ejidekwa onwe ya nʼụzọ kwesiri. onye ga-achọtali ya?

dị oke ọnụ karịa nkume rubi.

11 Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya,

dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.

12 Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma.

Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.

13 na-ahọrọ ajị anụ na flakisi

jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.

14 na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya

dịka a ga-asị na bụ ụgbọ mmiri.

15 Tupu chi abọzie,

nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri,

ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.

16 na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya.

bụ ego rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.

17 Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya.

dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.

18 na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa;

bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.

19 Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa;

mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.

20 na-agbasapụ aka

inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.

Veja também