10 Nwanyị nwere ugwu31:10 Maọbụ, Nwanyị nwere agwa ọma na-ejidekwa onwe ya nʼụzọ kwesiri. onye ga-achọtali ya?
Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
11 Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya,
ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.
12 Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma.
Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
13 Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi
jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.
14 Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya
dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri.
15 Tupu chi abọzie,
nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri,
ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
16 Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya.
Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.
17 Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya.
Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.
18 Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa;
ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.
19 Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa;
mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.
20 Ọ na-agbasapụ aka
inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.