Pular para o conteúdo
Publicidade

Ilu 31

10 Nwanyị nwere ugwu31:10 Maọbụ, Nwanyị nwere agwa ọma na-ejidekwa onwe ya nʼụzọ kwesiri. onye ga-achọtali ya?

dị oke ọnụ karịa nkume rubi.

11 Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya,

dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.

12 Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma.

Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.

13 na-ahọrọ ajị anụ na flakisi

jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.

14 na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya

dịka a ga-asị na bụ ụgbọ mmiri.

15 Tupu chi abọzie,

nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri,

ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.

16 na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya.

bụ ego rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.

17 Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya.

dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.

18 na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa;

bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.

19 Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa;

mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.

20 na-agbasapụ aka

inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.

21 Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche

nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.

22 na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina,

ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo31:22 Nʼoge ochie, naanị ndị ọgaranya na-eyi uwe na-acha odo odo, nʼihi na ọ bụ akwa dị oke ọnụ. dụọ.

23 Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo31:23 Ọnụ ụzọ ama obodo bụ ebe ndị okenye na-ezukọta akparịta ụka. Jen 19:1; Rut 4:1-3

ebe na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ.

24 na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu,

ndị na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.

25 bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ.

Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.

26 na-eji amamihe na-ekwu okwu

ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.

27 na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya,

naghị arụ ọrụ umengwụ.

28 Ụmụ ya na-ebili gọzie ya;

otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.

29 ga-asị; "E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha,

ma gị onwe gị kachasị ha niile mma."

30 Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge.

Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.

31 E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara.

Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.

Veja também