24 Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu,
ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.
25 Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ.
Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.
26 Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu
ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
27 Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya,
ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.