15 Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị;
mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.
16 Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ,
ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?
17 Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị,
nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya.
18 Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;
ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.
19 Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,
ka ara dị ya nʼobi zuore gị,
ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.
20 Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?
Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?