3 Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,
okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.
4 Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu
dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.
5 Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,
nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.
6 Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;
ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.
7 Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị,
unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.
8 Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!
Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,
9 ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,
maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.