Publicidade

Provérbios 5

3 Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,

okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.

4 Ma nʼikpeazụ, na-elu ilu dịka oluilu

dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.

5 Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,

nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.

6 Nʼihi na dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;

ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma maghị nke a.

7 Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị,

unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.

8 Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!

Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,

9 ka ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,

maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-