Pular para o conteúdo
Publicidade

Provérbios 6

6 Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ.

Mụta ihe site nʼụzọ ya niile.

7 bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha,

maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha,

8 ma na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị

ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi.

9 bụ ruo ole mgbe ka ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ?

Olee mgbe ka ga-esi nʼụra bilie?

10 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta,

nwa ịchịkọba aka nta zuo ike,

11 ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi,

ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.

Veja também