Publicidade

Provérbios 18

1 Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya,

na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.

2 Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.

Naanị ihe maara bụ ikwu uche ya.

3 Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,

otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.

4 Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,

ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.

5 dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,

si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.

6 Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,

ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.

7 Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,

egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.

8 Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,

ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.

9 Onye dị umengwụ nʼọrụ ya

bụ nwanne nke onye mbibi.

10 Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,

ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.

11 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,

bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.

12 Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga,

ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.

13 Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị

bụ enweghị uche na ihe ihere.

14 bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa,

ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-