1 Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya,
na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.
2 Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.
Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
3 Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,
otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.
4 Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,
ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.
5 Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,
si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.
6 Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,
ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
7 Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,
egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.
8 Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,
ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
9 Onye dị umengwụ nʼọrụ ya
bụ nwanne nke onye mbibi.
10 Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,
ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
11 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
12 Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga,
ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
13 Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị
bụ enweghị uche na ihe ihere.
14 Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa,
ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?