Publicidade

Provérbios 1

1 Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.

2 bụ maka amamihe na ntụziaka,

maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,

3 nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche,

ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.

4 Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche,

ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.

5 Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe maara,

ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.

6 Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile

na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.

7 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.

bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-