Ịba uru nke amamihe
1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile
zobekwa iwu m niile nʼime obi gị,
2 tọọ ntị gị nʼala nye amamihe,
wepụta obi gị inwe nghọta.
3 E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku,
ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,
4 ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha
maọbụ akụ nke zoro ezo,
5 mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị
chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.
6 Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe;
nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.2:6 1Ez 3:9,12; Job 32:8; Jem 1:5.