12 Lee ka i si site nʼeluigwe daa,
gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ.
Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ,
ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala.
13 Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị,
"Aga m arịgoro nʼeluigwe,
doo ocheeze m
nʼelu kpakpando niile Chineke kere;
aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ,
na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu.
14 Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe,
mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu."
15 Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili,
ruo na nsọtụ ala mmụọ.