Publicidade

Isaías 45

1 "Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ,

bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya

megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya,

napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile,

megheere ya ọnụ ụzọ niile

nke na dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya.

2 Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị

kwazee ugwu ukwu niile,

tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile

gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche.

3 Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara,

akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche.

Ka mata na bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,

bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.

4 Nʼihi Jekọb bụ ohu m,

nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m,

ka m ji kpọọ gị aha gị

nyekwa gị aha nke nsọpụrụ,45:4 Tuo gị aha nsọpụrụ

maọbụ ezie na maghị onye m bụ.

5 bụ m bụ Onyenwe anyị, dịghịkwa onye ọzọ dị;

ewezuga m, dịkwaghị Chineke ọzọ dị.

bụ ezie na maghị m,

ma aga m eme ka dịrị ike.

6 Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ

ruo nʼọdịda anyanwụ,

ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m.

Abụ m Onyenwe anyị, dịghịkwa onye ọzọ dị.

7 bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị.

bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi.

Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile.

8 "Gị, eluigwe, zodata ezi omume m

ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri.

Ka ala meghee onwe ya,

ka nzọpụta pupụta,

ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa.

bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile.

9 "Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ,

mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju

nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala.

Ụrọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị,

Gịnị ka i ji m akpụ?

Ka ọrụ gị ga-asị,

Lee, dịghị aka abụọ o nwere?

10 Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị,

Gịnị ka mụtara na nwa?

maọbụ sịkwa nne ya,

Gịnị bụ ihe mụpụtara?45:10 Ime gịnị na-eme gị

11 "Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel,

Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị;

banyere ihe ndị gaje ime

na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m,

maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m?

12 bụ mụ onwe m kere ụwa,

keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya.

Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe,

nyekwa kpakpando niile iwu.

13 M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m:

M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi.

ga-ewughachi obodo m,

mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha,

ma bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite,

ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru."

14 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

"Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush

na ndị Saba ahụ toro ogologo,

ha ga-abịakwute gị,

ha ga-abụ nke gị;

ha ga-esokwa gị nʼazụ

dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ.

Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị

rịọ gị arịrịọ, na-asị,

Nʼezie, bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị,

dịkwaghị chi ọzọ dị.’ "

15 Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel.

bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya.

16 A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere,

e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere.

17 Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta

nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel.

Ihere agaghị eme ha.

A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi.

18 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị,

bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha.

bụ ya, bụ Chineke,

onye zubere ma kee ụwa,

tọkwaa ntọala ya.

O keghị ụwa ka tọgbọrọ nʼefu,

kama bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya.

sịrị,

"Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị;

dịkwaghị Chineke ọzọ dị.

19 bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu,

site nʼotu ebe nʼala nke ọchịchịrị.

Agwaghị m mkpụrụ Jekọb

Chọọnụ m nʼefu.

Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị na-ekwu eziokwu,

Ana m ekwupụta ihe ziri ezi.

20 "Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ,

bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ.

Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee,

ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere.

21 Kwupụtanụ ihe kwesiri ịdị, gosinụ ya,

ka ha gbaakọkwa izu.

Onye buru ụzọ kwuo ihe ndị a nʼoge gara aga,

onye kwupụtara ya site na mgbe ochie?

bụghị mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị?

dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma bụghị mụ onwe m,

Chineke onye ezi omume na Onye nzọpụta;

dịghị onye ọzọ dị ma ewezuga m.

22 "Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu.

Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa.

Nʼihi na bụ naanị m bụ Chineke, dịkwaghị chi ọzọ dị.

23 Ejirila m onwe m ṅụọ iyi,

ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume,

bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe:

Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala;

mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi.

24 E, ha ga-ekwupụta sị, bụ nʼime Onyenwe anyị naanị

ka ezi omume na ike dị.’ "

Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya.

Ihere ga-emekwa ha.

25 Ma agbụrụ niile nke Izrel

ga-achọta nnapụta ha nʼime Onyenwe anyị,45:25 NʼOnyenwe anyị ka a ga-agụ agbụrụ niile nke Izrel ka ndị ezi omume.

bụkwa na ya ka ha ga-anya isi.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_12-11-46-