3 "Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb,
unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel,
unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu
na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu.
4 Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya,
ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu.
Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu.
Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.