25 Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
"Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha.
A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha.
Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha.
Aga m anapụtakwa ụmụ gị.