11 Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ,
ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya,
site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume,
ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.
12 Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba,53:12 Maọbụ, ndị dị ike
ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha,
nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ,
a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ,
rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.