5 Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị:
ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ.
E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ;
ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike.
6 Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ;
onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya.
Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya
ajọ omume anyị niile.
7 A kpagburu ya, mesie ya ihe ike,
ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta.
E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu,
dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị,
otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya.