Pular para o conteúdo
Publicidade

Isaías 58

3 Ha na-asị, Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ,

ma dịghị ahụta ya?

Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala,

ma dịghị ahụta nke a?

"Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu,

unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara.

4 Nʼoge ahụ, bụ ise okwu na ịlụ ọgụ,

ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu.

Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa

na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu.

5 Nke a bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara,

naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala?

bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara,

nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ?

bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ,

ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara?

6 "Nke a bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara:

Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi,

na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu,

na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha

na itiji yoku ọbụla?

Veja também