Ụwa ọhụrụ na eluigwe ọhụrụ
17 "Nʼihi na lee, ana m eke
eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.
Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ;
ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.
18 Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ
nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke,
nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ
ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.
19 Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem,
nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m;
a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ,
maọbụ olu iti mkpu akwa.