Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-atụkwasị Ijipt obi
1 Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka,
ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya,
ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ,
ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya.
Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel;
ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.
2 Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi.
Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya.
Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ;
ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka.